Igbo calendar

Igbo calendar
calendar

Igbo kalenda (Ogugu afo na ala igbo. Nke a bụ usoro omenala kalenda ndi Igbo di na Nigeria . Kalenda nwere ọnwa iri na ato n'afo, izu asaa n'ime otu ọnwa (na ụbọch ano nke na egosi ụbọchị ahịa Igbo (afor, nkwo, eke, na orie) n'ime izu () gbakwunyere otu ụbọchị ọzọ n'ụbọchị njedebe nke, afor n'ọnwa ikpeazu n' afo. Aha onye deputara onwa ndia bu Onwuejeogwu n'afo (1981).

Ọ bụ ezie na ofufe na mmụọ nsọpụrụ bụ akụkụ dị ukwuu n'ime ihe okike na mmepe nke usoro kalịnda Igbo, azụmahịa na-ekerekwa òkè dị ukwuu n'ịmepụta kalenda Igbo. E gosipụtara nke a na akụkọ ifo nke Igbo n'onwe ya. Ihe omumaatụ nke a bụ ụbọchị ahịa nke Igbo nke obodo ọ bụla nwere ụbọchị a ga-emepe iji mepee ahịa ya, n'ụzọ dị otú a ka ndi Igbo ka si eme kalenda Igbo.

Ụfọdụ obodo ndi Igbo agbaliala imezi ọnwa iri na atọ ka obula ọnwa iri na abụọ, dịka kalenda Gregorian. [1]

Kalenda obodo nile abughi otu, ya mere, otu di iche iche ga-abia n 'ebe di iche iche nke izu, ma obu kwa afo. Ka o sina dị, ụbọchị anọ na ubochi asatọ na ebuta mmekọrịta ụbọchị ahịa obodo di iche iche, Omumaatu. obodo Nri na-esokwa otu afo ahu.

  1. Jọn Ọfọegbu Ụkaegbu (1991). Igbo Identity and Personality Vis-à-vis Igbo Cultural Symbols. Universidad Pontificia de Salamanca, Facultad de Filosofia. 

From Wikipedia, the free encyclopedia · View on Wikipedia

Developed by Nelliwinne